Ọrụ Ndị Ozi 15

Ma ọ masịrị Saịlas ịnọtukwu nʼebe ahụ.

Acts 15:34 (UKJV) Notwithstanding it pleased Silas to abide there still.

32Judas na Saịlas, ndị ha onwe ha bụ ndị amụma, kwuru ọtụtụ okwu, iji gbaa ha ume na ime ka okwukwe ndị kwere ekwe guzosie ike.

33Mgbe ha nọnyesịrị ha nwa oge nta, ndị kwere ekwe ji ngọzị nke udo zilaga ha ka ha laghachikwuru ndị zitere ha.

34Ma ọ masịrị Saịlas ịnọtukwu nʼebe ahụ.

35Pọl na Banabas nọgidere nʼAntiọk, ebe ha na ndị ọzọ kuziri ihe ma kwusakwa okwu Onyenwe anyị.

36Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Pọl gwara Banabas, “Ka anyị gaghachi nʼobodo niile anyị kwusara okwu Onyenwe anyị nʼotu nʼotu, mata ka ndị kwere ekwe si agbalị nʼebe ahụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.