11Anyị banyere ụgbọ mmiri na Troas sị ya gafee Samotres. Nʼechi ya, anyị bịaruru Niapolis.
12Site nʼebe ahụ anyị jeruru Filipai nke bụ isi obodo dị nʼakụkụ mpaghara Masidonia bụrụkwa otu akụkụ nʼebe ndị Rom na-achị. Anyị nọdụrụ nʼime obodo a ọtụtụ ụbọchị.
13Nʼụbọchị izuike, anyị sitere nʼobodo ahụ gaa nʼakụkụ osimiri ebe anyị chọpụtara na ụlọ ekpere dị. Nʼebe a ka anyị nọ gwa ụmụ nwanyị ndị gbakọrọnụ okwu.
14Aha otu nʼime ndị inyom nụrụ okwu anyị bụ Lidia, onye obodo Tiatira, onye na-azụ ahịa akwa e sijiri odo odo. Ọ bụkwa nwanyị na-asọpụrụ Chineke. Onyenwe anyị meghere obi ya, ige ntị nʼihe Pọl na-ekwu.
15Ka e mesịrị ya na ezinaụlọ ya baptizim, ọ rịọrọ anyị na-asị, “Ọ bụrụ nʼezie na unu gụrụ m dịka onye kwesiri ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, batanụ nʼụlọ m nọrọ.” Mgbe ọ kwagidesịrị anyị ike, anyị sooro ya.