15Ka e mesịrị ya na ezinaụlọ ya baptizim, ọ rịọrọ anyị na-asị, “Ọ bụrụ nʼezie na unu gụrụ m dịka onye kwesiri ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, batanụ nʼụlọ m nọrọ.” Mgbe ọ kwagidesịrị anyị ike, anyị sooro ya.
16Otu ụbọchị, mgbe anyị na-aga nʼụlọ ekpere, anyị zutere otu nwaagbọghọ bụ ohu, onye nwere mmụọ ịgba afa. Ọ na-ewetara ndị nwe ya ezigbo ego site nʼịgba afa.
17Ma o sogidere anyị na Pọl ebe ọbụla anyị na-aga, na-eti mkpu na-asị, “Ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ha bịara ikwupụtara unu ihe banyere ụzọ nzọpụta.”
18O mere nke a ọtụtụ ụbọchị. Ma site nʼoke iwe, Pọl baara mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime ya mba sị, “Eji m aha Jisọs Kraịst na-enye gị iwu sị gị site nʼime ya pụta!” Otu mgbe ahụ o siri nʼime ya pụta.
19Mgbe ndị nwe ya hụrụ nʼolileanya ha iji inweta ego akwụsịla, ha jidere Pọl na Saịlas dọkpụrụ ha jekwuru ndịisi obodo nʼọma ahịa.