23Mgbe ha pịachara ha ihe nke ọma, a tụnyere ha nʼime ụlọ mkpọrọ, nyekwa onye nche iwu ka o chee ha nke ọma.
24Nʼihi nke a, o tinyere ha nʼime ime ụlọ mkpọrọ, ebe o jiri ọtọsị kegide ha nʼụkwụ.
25Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị.
26Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara.
27Mgbe onyeisi nche ụlọ mkpọrọ tetara nʼụra ma hụ na ọnụ ụzọ niile ghere oghe. Nʼihi ya, o chere na ndị mkpọrọ niile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya.