29Onyeisi nche ahụ kpọrọ ka eweta ọkụ, ọ gbabara nʼime, daa nʼụkwụ Pọl na Saịlas na-ama jijiji.
30Ọ kpọpụtara ha nʼezi sị, “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?”
31Ha sịrị, “Kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinaụlọ gị niile.”
32Mgbe ahụ, ha gwara ya na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya okwu nke Onyenwe anyị.
33Nʼotu elekere ahụ, nʼabalị ahụ, ọ sachara ọnya ha. Nʼatụfughị oge, ha mere ya na ezinaụlọ ya baptizim.