Ọrụ Ndị Ozi 16

Ihe ndị a niile mere ka nzukọ sie ike nʼokwukwe ma baakwa ụba nʼọnụọgụgụ kwa ụbọchị.

Acts 16:5 (UKJV) And so were the churches established in the faith, and increased in number daily.

3Pọl chọrọ ka Timoti soro ya nʼije ya. Ma nʼihi ndị Juu bi nʼakụkụ ebe ahụ, o biri ya ugwu nʼihi na mmadụ niile maara na nna ya bụ onye Griik.

4Dịka ha na-eme njem site nʼobodo ruo nʼobodo, ha na-akọwara ha ihe banyere mkpebi ndị ozi na ndị okenye kpebiri na Jerusalem ka ha nwe ike idebe ha.

5Ihe ndị a niile mere ka nzukọ sie ike nʼokwukwe ma baakwa ụba nʼọnụọgụgụ kwa ụbọchị.

6Ha gara mpaghara Frigia na Galeshịa. Ma Mmụọ Nsọ ekweghị ka ha kwusaa oziọma nʼakụkụ Eshịa nʼoge ahụ.

7Mgbe ha ruru nʼakụkụ obodo Misia, ha chere ihu ịbanye nʼakụkụ obodo Bitinia. Ma Mmụọ Nsọ nke Jisọs akwagideghị ka ha gaa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.