Ọrụ Ndị Ozi 17

Mgbe Pọl nọ na-echere ha nʼAtens, o wutere mmụọ ya nke ukwuu nʼihi arụsị niile ọ hụrụ, nke jupụtara nʼobodo ahụ.

Acts 17:16 (UKJV) Now while Paul waited for them at Athens, his spirit was stirred in him, when he saw the city wholly given to idolatry.

14Ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl ka ọ gaa nʼakụkụ oke osimiri dị nʼebe ahụ. Ma ha hapụrụ Saịlas na Timoti ka ha na ha nọdụ.

15Ma ndị dupuru Pọl sooro ya ruo obodo Atens. Ha lawara, hapụrụ Saịlas na Timoti ozi ka ha bịakwute ya na-atụfughị oge.

16Mgbe Pọl nọ na-echere ha nʼAtens, o wutere mmụọ ya nke ukwuu nʼihi arụsị niile ọ hụrụ, nke jupụtara nʼobodo ahụ.

17Nʼihi nke a, ya na ndị Juu na ndị na-atụ egwu Chineke, na-anọgide nʼụlọ nzukọ na-arụrịta ụka. Kwa ụbọchị, ọ na-apụkwa nʼọma ahịa na-agwa ndị niile o zutere okwu.

18Ya na ụfọdụ ndị Epikuri na ndị Stoịk bụ ndị ọkachamara na-arụrịta ụka. Ndị ụfọdụ na-asị, “gịnị ka onye ekwurekwu a ga-ekwu?” Ndị ọzọ sịrị, “ọ dịka onye na-ekwusa ụmụ mmụọ ndị ala ọzọ.” Ha kwuru nke a nʼihi na ọ na-ekwusa oziọma banyere Jisọs na mbilite nʼọnwụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.