1Mgbe ha gafechara obodo Amfipolis na Apolonia, ha bịaruru obodo Tesalonaịka, ebe ụlọ nzukọ ndị Juu dị.
2Pọl bakwuuru ha, dịka ọ na-eme oge niile. Ọ nọnyere ha izu ụka atọ, ya na ha na-atụgharị uche nʼAkwụkwọ Nsọ,
3na-akọwara ha na-edokwa ha anya na ọ dị mkpa na Kraịst ga-ahụ ahụhụ, ma sitekwa nʼọnwụ bilie. Ọ sịrị, “Jisọs a, nke m na-ekwusara unu bụ Kraịst ahụ.”
4Ụfọdụ nʼime ndị Juu ahụ ka e mere ka ha kwere ma sonyere Pọl na Saịlas, otu aka ahụ, igwe mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke nʼetiti ndị Griik na ụmụ nwanyị ụfọdụ a maara aha ha.
5Ma ndị Juu jupụtara nʼekworo, nʼihi ya, ha kpaliri obi ụfọdụ mmadụ efu nʼetiti ha nʼọma ahịa. Ndị a malitekwara ọgbaaghara nʼụzọ dị iche nʼime obodo. Ha tikasịrị ụlọ Jesin, nʼihi na ha chọrọ ịdọpụta ha nyefee ha nʼaka ọha mmadụ.