Ọrụ Ndị Ozi 19

Chineke sitere nʼaka Pọl rụọ ọtụtụ ọrụ ebube pụrụ iche.

Acts 19:11 (UKJV) And God wrought special miracles by the hands of Paul:

9Ma ụfọdụ nʼime ha mechiri obi ha; ha juru ikwenye, kama ha kwuru okwu ọjọọ megide Ụzọ ahụ nʼihu ọgbakọ ahụ niile. Ya mere, o sitere nʼebe ha nọ pụọ, kpọrọkwa ndị na-eso ụzọ ahụ, ha na-akparịta ụka kwa ụbọchị nʼụlọ ọgbakọ Tiranọs.

10Ihe ndị a gakwara nʼihu afọ abụọ. Ndị niile bi na Eshịa nụkwara oziọma Onyenwe anyị. Ọtụtụ nʼime ha bụ ndị Juu, ma ndị ọzọ bụ ndị Griik.

11Chineke sitere nʼaka Pọl rụọ ọtụtụ ọrụ ebube pụrụ iche.

12Nke bụ na-ewere ụfọdụ nʼime akịsị maọbụ ịchafọ na akwa mgbochi nke metụrụ ya nʼahụ na-atụkwasị nʼahụ ndị ọrịa, ahụ a dịkwa ha ike. E sitekwara na ya chụpụ mmụọ ọjọọ.

13Ụfọdụ ndị Juu dịkwa ndị na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼime mmadụ. Ha chọkwara ime nke a nʼaha Onyenwe anyị Jisọs na-asị, “E ji m aha Jisọs, onye Pọl na-ekwusa na-enye unu iwu ka unu site nʼime ya pụta.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.