Ọrụ Ndị Ozi 19

Nwoke a kpọkọtara ndị ọrụ ya niile, na ndị ya na ha na-arụkọ otu ọrụ, sị, “Ndị ibe m, unu ma na ọ bụ site nʼọrụ nke a ka anyị si enweta akụnụba anyị.

Acts 19:25 (UKJV) Whom he called together with the workmen of like occupation, and said, Sirs, all of you know that by this craft we have our wealth.

23Ma ọ bụ nʼoge a ka oke nsogbu malitere megide Ụzọ ahụ.

24Otu onye ụzụ na-agbaze ọlaọcha, aha ya bụ Dimitriọs, onye ji ọlaọcha na-akpụ ụlọ arụsị ala ahụ a na-akpọ Atemis. Ọ na-ewetara ya na ndị ụzụ ibe ya ego nʼebe o hiri nne.

25Nwoke a kpọkọtara ndị ọrụ ya niile, na ndị ya na ha na-arụkọ otu ọrụ, sị, “Ndị ibe m, unu ma na ọ bụ site nʼọrụ nke a ka anyị si enweta akụnụba anyị.

26Unu niile ahụla ma nụkwa, otu nwoke a na-akpọ Pọl si rafuo ọtụtụ ndị mmadụ site nʼime ka ha kwenye na chi ọbụla e ji aka mee abụghị chi. Ọ bụkwaghị naanị nʼEfesọs kama ọ fọdụrụ ihe nta ka ọ bụrụ nʼEshịa niile.

27Ọ bụkwaghị naanị na ihe ize ndụ dị banyere ọrụ aka anyị nke a ga elelị kama tinyere nke a, ụlọ nke oke chi nwanyị bụ Atemis agaghị enwekwa nsọpụrụ. Ya bụ, chi nwanyị nʼonwe ya bụ onye a na-efe nʼobodo Eshịa niile nakwa nʼelu ụwa niile ka a ga-anapụ nkwanye ugwu dịrị ya dịka chi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.