29Nʼihi na amaara m na mgbe m lachara, agụ jọgburu onwe ya ga-abata nʼetiti unu nke na-agaghị emere igwe atụrụ ebere.
30Ụfọdụ nʼime unu ga-ebili tụgharịa eziokwu ahụ ịhụ ka ha si otu a dọrọ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ nye onwe ha.
31Ya mere, na-echenụ nche! Chetakwanụ na nʼime afọ atọ m nọrọ nʼetiti unu, ehihie na abalị, eji m ịkwa akwa na anya mmiri na-adụ unu ọdụ.
32“Ugbu a ana m etife unu nʼaka Chineke na nlekọta ya. Ana m etifekwa unu nʼaka okwu amara ya nke pụrụ ịgba okwukwe unu ume na inyekwa unu akụnụba ọ kwadobeere ndị ahụ e doro nsọ.
33Ọ dịghị mgbe ọbụla agụụ ịdọtara onwe m ọlaọcha maọbụ ọlaedo maọbụ uwe nke onye ọbụla ji gụọ m.