Ọrụ Ndị Ozi 20

Ọtụtụ oriọna dịkwa nʼime ọnụụlọ ahụ dị nʼụlọ elu ebe anyị zukọrọ.

Acts 20:8 (UKJV) And there were many lights in the upper chamber, where they were gathered together.

6Mgbe Mmemme Ngabiga ahụ gwụsịrị, anyị banyere ụgbọ mmiri rute Filipai bịakwute ha na Troas nʼụbọchị nke ise. Anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị asaa.

7Nʼụbọchị mbụ nʼizu ụka, mgbe anyị zukọrọ ịnyawa achịcha, Pọl gwara ha okwu, ebe ọ na-akwado ịla ma chi bọọ, o kwugidere okwu ruo nʼetiti abalị.

8Ọtụtụ oriọna dịkwa nʼime ọnụụlọ ahụ dị nʼụlọ elu ebe anyị zukọrọ.

9Otu nwokorobịa a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala nʼoghereikuku, ọ bụ onye oke ụra bidoro ịtụ dịka Pọl na-ekwu okwu ruo oge dị anya. Mgbe ọ dara nʼoke ụra a, o sitere na nʼụlọ elu nke atọ dapụ, daa nʼala. Mgbe e buliri ya, ọ bụ onye nwụrụ anwụ.

10Pọl rituru nʼala selite ya elu jikụọ ya. Ọ sịrị ndị gbakọrọ nʼebe ahụ sị, “Ka obi hapụ ịlọ unu mmiri ọ dị ndụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.