8Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị gara nʼihu nʼije anyị rute Sizaria. Nʼebe ahụ, anyị nọnyeere otu nwanna anyị a na-akpọ Filip onye na-agbasa oziọma. Ọ bụ otu nʼime mmadụ asaa ahụ.
9O nwere ụmụ agbọghọ anọ ndị na-alụbeghị di. Ha nwekwara onyinye ibu amụma.
10Mgbe anyị nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, ka otu onye amụma a na-akpọ Agabọs, si Judịa bata.
11Ọ bịakwutere anyị, chilite belịt Pọl na-eke nʼukwu, kee onwe ya nʼụkwụ na aka sị, “Dịka Mmụọ Nsọ kwuru, ‘otu a ka ndị ndu ndị Juu ga-eke onye nwe ihe a agbụ na Jerusalem. Ha ga-ararakwa ya nye nʼaka ndị mba ọzọ.’ ”
12Mgbe anyị nụrụ nke a, anyị na ndị niile nọ nʼebe ahụ rịọrọ Pọl ka ọ ghara ịga Jerusalem.