12Mgbe anyị nụrụ nke a, anyị na ndị niile nọ nʼebe ahụ rịọrọ Pọl ka ọ ghara ịga Jerusalem.
13Ma Pọl zaghachiri, “Gịnị ka unu na-eme, ọ bụ akwa ka unu na-ebe, na-eme ka obi gbawaa m? Nʼihi na ọ bụghị naanị na m dị njikere ka e kee m agbụ, kama ejikekwara m iwere ndụ m nye na Jerusalem nʼihi aha Onyenwe anyị Jisọs.”
14Ebe ọ na-ekweghị ege anyị ntị, anyị kwụsịrị ma sị, “Ka e mee uche Onyenwe anyị.”
15Mgbe ụbọchị ndị a gasịrị, anyị jikere bilie ịga Jerusalem.
16Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ ndị nọ na Sizaria, duuru anyị gaa, ha kpọruru anyị nʼụlọ Mnasin, onye Saiprọs ebe anyị ga-anọ dịka ọbịa, onye sitere na mbụ bụrụ onye na-eso ụzọ ahụ.