17Mgbe anyị rutere Jerusalem, ndị ụmụnna jiri obi ụtọ nabata anyị.
18Nʼụbọchị nke so ya, anyị na Pọl gara ileta Jemis, ndị okenye niile nọkwa nʼebe ahụ.
19Mgbe o kelechara ha, ọ kọọrọ ha nʼotu nʼotu, ihe niile Chineke rụrụ nʼetiti ndị mba ọzọ site nʼije ozi ya.
20Mgbe ha nụchara nke a, ha nyere Chineke otuto. Emesịa, ha sịrị Pọl, “Leenụ nwanna, otu ọtụtụ puku ndị Juu si bụrụ ndị kwere ekwe, ha niile ka ihe banyere iwu a na-anụ ọkụ nʼobi.
21A kọọrọla ha ihe banyere gị, na ị na-ezi ndị Juu bi nʼetiti ndị mba ọzọ ka ha hapụ ịgbasokwa iwu Mosis, na ka ha kwụsịkwa ibi ụmụ ha ugwu maọbụ bie ndụ nʼusoro omenaala anyị.