Ọrụ Ndị Ozi 21

Mgbe anyị hapụrụ Taịa, anyị kwụsịrị na Tolomas. Nʼebe a anyị kelekwara ndị kwere ekwe nọ nʼime obodo a, nọnyere ha naanị otu ụbọchị.

Acts 21:7 (UKJV) And when we had finished our course from Tyre, we came to Ptolemais, and saluted the brethren, and abode with them one day.

5Mgbe anyị nọzuru ụbọchị anyị, anyị hapụrụ ha, bilie ije. Ha na nwunye ha na ụmụ ha so dupu ruo mgbe anyị si nʼobodo ahụ pụọ. Anyị na ha gburu ikpere nʼala nʼọnụ mmiri kpee ekpere.

6Mgbe ahụ, anyị kelere onwe anyị ekele ikpeazụ. Emesịa, anyị banyere nʼime ụgbọ, ma ha laghachiri azụ nʼụlọ ha.

7Mgbe anyị hapụrụ Taịa, anyị kwụsịrị na Tolomas. Nʼebe a anyị kelekwara ndị kwere ekwe nọ nʼime obodo a, nọnyere ha naanị otu ụbọchị.

8Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị gara nʼihu nʼije anyị rute Sizaria. Nʼebe ahụ, anyị nọnyeere otu nwanna anyị a na-akpọ Filip onye na-agbasa oziọma. Ọ bụ otu nʼime mmadụ asaa ahụ.

9O nwere ụmụ agbọghọ anọ ndị na-alụbeghị di. Ha nwekwara onyinye ibu amụma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.