27Ọchịagha ahụ bịakwutere sị ya, “Gwa m, ị bụ onye Rom?” Ọ sịrị, “E.”
28Ọchịagha ahụ zara, “ma o furu m ego dị ukwuu iji bụrụ onye Rom.” Ma Pọl sịrị, “Amụrụ m dịka nwa afọ ala a.”
29Ndị ahụ chọrọ ịgba ya ajụjụ ọnụ mere ngwangwa wezuga onwe ha. Egwu tụkwara ọchịagha nʼonwe ya mgbe ọ matara na ọ bụ nwa afọ Rom, nʼihi na o keela ya rịị agbụ na mbụ.
30Nʼechi ya, ebe ọ chọrọ ịmata ihe bụ isi okwu na ihe mere ndị Juu ji ebo ya ebubo, o nyere iwu ka ndịisi nchụaja na ndị ụlọ ikpe ha zukọọ. Mgbe ahụ, o dupụtara Pọl, mee ka o guzo nʼihu ha.