19Onyeisi agha ahụ duuru ya nʼaka ya gaa nʼakụkụ ọzọ jụọ ya, “Gịnị bụ ihe ị chọrọ ịkọrọ m?”
20Ọ sịrị, “Ndị Juu ụfọdụ ekwekọrịtala ịrịọ gị ka ị kpọpụta Pọl echi na nzukọ ụlọ ikpe. Ha ga-eme dịka ha nwere ihe dị mkpa ha chọrọ ịjụta ya.
21Ma aṅala ha ntị. Nʼihi na ihe karịrị iri mmadụ anọ na-ezo onwe ha na-eche inwude ya. Ndị a gbara ndụ na ha agaghị eri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu ya. Ha adịla njikere, ihe a na-eche bụ mkpebi gị nye arịrịọ ha.”
22Ọchịagha ahụ zilagara nwokorobịa ahụ site nʼinye ya iwu, “Emekwala ka onye ọbụla mata na ị bịara gwa m ihe dị otu a.”
23Mgbe e mesịrị, ọ kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndịisi agha nye ha iwu sị, “Gaanụ jikere narị ndị agha abụọ, na iri mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya, tinyere narị ndị ikom abụọ ndị na-ama ùbe, ndị ga-aga Sizaria nʼelekere itoolu nke abalị a.