24Nyekwa Pọl ịnyịnya nke ọ ga-agba, ka e nwee ike duru ya gakwuru Feliks bụ gọvanọ nʼudo.”
25O dere akwụkwọ nʼolu dị otu a:
26Klọdiọs Lisias, Na-edegara Feliks onye nsọpụrụ na-adịrị, onye na-achị akụkụ a. Ana m ekele gị.
27Ndị Juu jidere nwoke a chọọ igbu ya, ma mgbe m nụrụ na ọ bụ onye Rom, mụ na ndị agha m bịara napụta ya nʼaka ha.
28Achọrọ m ịmata ihe mere ha ji ebo ya ebubo, nʼihi ya eduuru m ya gaa nʼọgbakọ ndị okenye ha.