1Mgbe ụbọchị ise gasịrị, onyeisi nchụaja bụ Ananayas na ụfọdụ ndị okenye ndị Juu na lọya ha aha ya bụ Tatulọs bịara. Ha dum pụtara ịgbagide Pọl ama nʼihu onye na-achị obodo.
2Mgbe a kpọbatara ya, Tatulọs pụtara guzo boo ya ebubo sị, “Onye a na-asọpụrụ ka ị bụ. Nʼihi gị, mmadụ niile enwela udo ogologo mgbe. Ịdị nkọ nke uche gị emeela ka mgbanwe dị nʼobodo a.
3Anyị ji ekele nke jupụtara nʼọṅụ na-anabata ihe ndị a nke ọma, nʼebe niile na nʼụzọ niile, gị Feliks, onye a na-asọpụrụ.
4Achọghị m itufu oge gị. Ana m arịọ ka i were ndidi na obiọma nụrụ nkenke okwu anyị ji bịa.