4Achọghị m itufu oge gị. Ana m arịọ ka i were ndidi na obiọma nụrụ nkenke okwu anyị ji bịa.
5“Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-akpalikarị ọgbaaghara, onye ọrụ ya bụ ịkwagide ndị Juu nọ nʼebe niile nʼụwa a ka ha nupu isi. Ọ bụkwa onyeisi nke ajọ otu ahụ a na-akpọ Otu ndị Nazaret.
6Ọ chọkwara imerụ ụlọnsọ anyị, ya mere anyị ji jide ya. Ma anyị chọrọ ikpe ya ikpe dịka omenaala anyị siri dị,
7ọchịagha Lisias, bịara jiri ike napụ ya nʼaka anyị.
8Ọ bụrụ na inyochaa ya, ị ga-enwe ike ịghọta ihe niile banyere ebubo anyị na-ebo ya.”