7ọchịagha Lisias, bịara jiri ike napụ ya nʼaka anyị.
8Ọ bụrụ na inyochaa ya, ị ga-enwe ike ịghọta ihe niile banyere ebubo anyị na-ebo ya.”
9Ndị Juu kwadokwara okwu ya, na ihe niile e boro ya, bụ ihe mere eme.
10Mgbe gọvanọ feere ya aka ka o kwuo okwu, Pọl zara, “amaara m na ị bụ onye ọkaikpe nke mba a ogologo mgbe. Nke a na-enye m obi ụtọ ịgọpụ onwe m nʼihu gị.
11Ị pụrụ ịchọpụta na o rubeghị ụbọchị iri na abụọ kemgbe m rigooro nʼụlọnsọ ukwu na Jerusalem ife ofufe.