9Ma ebe Festọs na-achọ inwe ihuọma nʼebe ndị Juu nọ, ọ sịrị Pọl, “Ị chọrọ ịga Jerusalem ka m kpee gị ikpe nʼebe ahụ?”
10Ma Pọl sịrị, “Eguzo m nʼụlọikpe Siza nʼonwe ya, ebe e kwesiri ka a nọdụ kpee m ikpe. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ndị Juu, dịka ị maara nke ọma.
11Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere kwesiri ọnwụ, anaghị m arịọ ka m gbanarị ọnwụ. Ma ọ bụrụ na ọ dịghị eziokwu dị nʼebubo ndị Juu a na-ebo m, mmadụ ọbụla agaghị e were m nyefee nʼaka ha. Ya mere, ọ bụ Siza ka m na-akpọku.”
12Ya mere, mgbe Festọs na ndị na-adụ ya ọdụ gbara izu, ọ zara, “Ị kpọkuola Siza, ọ bụkwa Siza ka ị ga-agakwuru.”
13Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, eze Agripa na Benaisi bịara Sizaria ịnabata Festọs.