Ọrụ Ndị Ozi 26

Nʼoge ehihie, eze Agripa, mgbe mụ na ndị otu m na-aga nʼụzọ, gị onye a na-asọpụrụ, ka m hụrụ ìhè nke na-acha karịa anyanwụ ka o si nʼeluigwe chaa m na ndị mụ na ha so gburugburu.

Acts 26:13 (UKJV) At midday, O king, I saw in the way a light from heaven, above the brightness of the sun, shining round about me and them which journeyed with me.

11Ọtụtụ mgbe ka m hụrụ na a tara ha ahụhụ nʼụlọ nzukọ niile. Agbalịrị m ịkwagide ha ka ha kwuo arụ ma kwutọkwa okwukwe ha. Nʼihi na iwe m dị ọkụ megide ha, esogburu m ha nʼobodo dị iche iche nke na-abụghị obodo ndị Juu.

12“Nʼihi nke a, a gara m Damaskọs site nʼikike na nkwenye nke ndịisi nchụaja. Anatakwara m ike nʼaka ndịisi nchụaja.

13Nʼoge ehihie, eze Agripa, mgbe mụ na ndị otu m na-aga nʼụzọ, gị onye a na-asọpụrụ, ka m hụrụ ìhè nke na-acha karịa anyanwụ ka o si nʼeluigwe chaa m na ndị mụ na ha so gburugburu.

14Anyị niile dara nʼala. Ma anụrụ m olu gwara m okwu nʼasụsụ Hibru, ‘Sọl! Sọl! Gịnị mere i ji na-akpagbu m? Ị na-emerụ onwe gị ahụ site nʼịkpọ ụkwụ na ndụdụ e ji achị ehi.’

15“Asịrị m, ‘Ị bụ onye, Onyenwe anyị?’ “Onyenwe anyị kwuru, ‘Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.