23na Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ, bụrụkwa onye mbụ ga-esi nʼọnwụ bilie, iwetara ndị Juu na ndị mba ọzọ ìhè.”
24Mgbe ọ na-agọpụ onwe ya, Festọs tiri mkpu, “Pọl, ị bụ onye isi mebiri! Oke mmụta gị emebiela gị isi.”
25Ma Pọl sịrị, “Isi emebighị m, ezigbo nna anyị Festọs. Ihe m na-ekwu nʼanya udo bụ naanị eziokwu.
26Eze nʼonwe ya makwaara ihe ndị a niile, nʼihi ya ejighị m egwu ọbụla agwa ya okwu a. Ekwenyere m na ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe ndị a merenụ nke ezonarịrị ya, nʼihi na o nweghị nke mere na nzuzo.
27Gị eze Agripa, i kwenyeghị na ndị amụma? Amaara m na i kweere.”