27Gị eze Agripa, i kwenyeghị na ndị amụma? Amaara m na i kweere.”
28Mgbe ahụ Agripa sịrị, “Pọl, ị na-achọ nʼime ntakịrị oge a ịkwagide m ka m bụrụ onye kwere na Kraịst?”
29Ma Pọl sịrị, “Ọ gaara atọ m ụtọ ma ọ bụrụ na Chineke ga-ekwe, mee ka gị na ndị niile nọ nʼebe a bụrụ ihe mụ onwe m bụ nʼime Kraịst ma ewezuga agbụ ndị a.”
30Mgbe ahụ eze biliri ọtọ, ya na Festọs na Benaisi nwunye ya na ndị ọzọ niile ya na ha nọ nʼoche.
31Mgbe ha na-apụ, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Nwoke a emeghị ihe ọbụla kwesiri ọnwụ maọbụ ịga mkpọrọ.”