12Ma ebe ọnụ mmiri a abụghị ebe dị mma ịnọ nʼoge oyi, ndị ka nʼọnụọgụgụ họọrọ ka ụgbọ ahụ gaa nʼihu, nʼolileanya na a ga-eru Fonikisi ebe ha ga-anọdụ nʼoge oyi. Nke a bụ ọnụ mmiri dị na Kriit, nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ nʼakụkụ ugwu na akụkụ ndịda.
13Mgbe ikuku dị nwayọọ bidoro ifegharị site na ndịda, ha chere na nke a bụ ohere dịrị ha. Nʼihi ya, ha kwọpụrụ ụgbọ nyara ya na-aga nso nso ọnụ mmiri Kriit.
14Ma mgbe na-adịghị anya, oke ifufe dị egwu nke si nʼagbata ugwu na ọwụwa anyanwụ kuru site nʼagwa etiti ahụ rịdata.
15Ndị na-anya ụgbọ ahụ gbalịsịrị ike na mbụ ichigharị ihu ụgbọ ahụ ka ọ gaa nʼọnụ mmiri, ma ọ pụghị ime. Anyị hapụrụ ya ka o soro ikuku.
16Nʼikpeazụ, anyị kwọọrọ ụgbọ anyị gaa nʼazụ agwa etiti nta a na-akpọ Klọda. Nʼebe ahụ anyị jisiri ike kekwasị ụgbọ nta nke ụgbọ mmiri anyị na-adọkpụ nʼazụ nʼelu ụgbọ mmiri ahụ.