34Nʼihi ọdịmma nke ndụ unu, ana m arịọ unu ka unu rie ihe. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu otu agịrị isi ya ga-ala nʼiyi.”
35Mgbe o kwuchara nke a, o weere achịcha nye Chineke ekele nʼihu ha niile, nyawaa ya, malitekwa iri ya.
36Otu mgbe ahụ, obi ụtọ batara mmadụ niile nʼobi, ha bidokwara iri nri.
37Anyị niile nọ nʼụgbọ ahụ dị narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii.
38Mgbe anyị richara nri, ha buuru akpa ọka niile dị nʼụgbọ ahụ tụba ha nʼime osimiri ime ka ụgbọ ahụ gbaa mfe.