1Mgbe a pụtara nʼọnụ mmiri ahụ nʼudo, anyị chọpụtara na aha agwa etiti ahụ bụ Malta.
2Ndị obodo ahụ gosiri anyị obiọma nʼụzọ pụrụ iche. Ha kwanyere anyị ọkụ ma nabatakwa anyị nʼihi na mmiri nọ na-ezo, oyi na-atụkwa.
3Nʼoge Pọl na-achịkọta nkụ itinye nʼọkụ a, otu agwọ ajụala sitere nʼime nkụ na-enwu ọkụ mapụta nʼihi okpomọkụ tụhịkọ onwe ya nʼaka ya.