Ọrụ Ndị Ozi 28

Ndị ọchịchị Rom lenyere anya nʼikpe m chọọ ịhapụ m ka m laa nʼihi na ha achọtaghị ihe kwesiri ịma m ikpe ọnwụ dịka ndị anyị chọrọ.

Acts 28:18 (UKJV) Who, when they had examined me, would have let me go, because there was no cause of death in me.

16Mgbe anyị bịaruru Rom, e nyere Pọl ohere ibiri onwe ya dịka o si chọọ nʼebe masịrị ya. Ma otu onye agha na-eche ya nche.

17Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ kpọrọ ndịisi ndị Juu. Mgbe ha zukọrọ, ọ gwara ha, “Ụmụnna m, ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide ndị nke anyị, maọbụ megide omenaala nna nna anyị ha, ha jidere m na Jerusalem were m nyefee m nʼaka ndị Rom.

18Ndị ọchịchị Rom lenyere anya nʼikpe m chọọ ịhapụ m ka m laa nʼihi na ha achọtaghị ihe kwesiri ịma m ikpe ọnwụ dịka ndị anyị chọrọ.

19Ma mgbe ndị Juu jụrụ, ahụrụ m na ọ dị mkpa ibutere Siza ikpe m. Ma o nweghị ihe ọjọọ m bu nʼuche megide ndị obodo m.

20Nʼihi nke a, ka m jiri rịọọ ka mụ na unu hụ ma kwurịtakwa okwu. Ọ bụ nʼihi olileanya nke Izrel ka e ji kee m nʼagbụ igwe a.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.