Ọrụ Ndị Ozi 3

Ma unu bụ ndị nketa nke ndị amụma, nakwa nke ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na nna nna unu gbara, mgbe ọ gwara Ebraham, ‘Site na mkpụrụ gị ka a ga-agọzi mba niile nke ụwa.’

Acts 3:25 (UKJV) All of you are the children of the prophets, and of the covenant which God made with our fathers, saying unto Abraham, And in your seed shall all the families of the earth be blessed.

23Onye ọbụla jụrụ ige onye amụma ahụ ntị, ka a ga-ekewapụ kpamkpam site nʼetiti ndị ya ma bibiekwa ya.’

24“Nʼezie ndị amụma niile site na Samuel na ndị ọzọ so ya nʼazụ, bukwara amụma banyere ụbọchị ndị a.

25Ma unu bụ ndị nketa nke ndị amụma, nakwa nke ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na nna nna unu gbara, mgbe ọ gwara Ebraham, ‘Site na mkpụrụ gị ka a ga-agọzi mba niile nke ụwa.’

26Mgbe Chineke kpọlitere onyeozi ya, o buuru ụzọ zitere unu ya, ka ọ gọzie unu site nʼime ka onye ọbụla nʼime unu chegharịa site nʼụzọ ọjọọ ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.