Ọrụ Ndị Ozi 3

Ma Pita na Jọn legidere ya anya, Pita sịrị, “Lee anyị anya.”

Acts 3:4 (UKJV) And Peter, fastening his eyes upon him with John, said, Look on us.

2Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma.

3Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịba nʼụlọnsọ ukwu ahụ, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ.

4Ma Pita na Jọn legidere ya anya, Pita sịrị, “Lee anyị anya.”

5O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye.

6Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.