Ọrụ Ndị Ozi 4

Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a? Anyị apụghị ịgọ agọ na ha rụrụ ọrụ ịrịbama pụrụ iche. Ndị niile bi na Jerusalem maara ihe banyere nke a.

Acts 4:16 (UKJV) Saying, What shall we do to these men? for that indeed a notable miracle has been done by them is manifest to all them that dwell in Jerusalem; and we cannot deny it.

14Ma mgbe ha hụrụ nwoke ahụ a gwọrọ, ka o guzo nʼakụkụ ha, ha enweghị okwu ọbụla ha nwere ikwu megide nke a.

15Ha nyere iwu ka ha si nʼụlọikpe ahụ pụọ, ma bido ịgba izu nʼetiti onwe ha banyere nke a.

16Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a? Anyị apụghị ịgọ agọ na ha rụrụ ọrụ ịrịbama pụrụ iche. Ndị niile bi na Jerusalem maara ihe banyere nke a.

17Ma iji mee ka akụkọ ọrụ ebube a hapụ ịgbasa ruo ọtụtụ mmadụ ntị, ka anyị dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọbụla okwu banyere aha nwoke a.”

18Ha kpọrọ ha nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu maọbụ izi ihe nʼaha Jisọs.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.