1Mgbe ha nọ na-agwa ndị mmadụ ahụ okwu, ndị nchụaja na onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu ahụ na ndị Sadusii bịakwutere ha.
2Ha were oke iwe nʼihi na ha na-ezi ndị mmadụ ihe, na-ekwusakwa na nʼime Jisọs ka mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ dị.
3Ha jidere ha tinye ha nʼụlọ mkpọrọ, ruo nʼechi ya. Nʼihi na oge e jidere ha bụ nʼoge uhuruchi.
4Ma ọtụtụ ndị nụrụ okwu ahụ kwenyere. Ọnụọgụgụ ha ruru ihe dị ka puku mmadụ ise.