13O nweghị onye ọbụla kwere iso ha ọzọ, nʼagbanyeghị na ọtụtụ mmadụ na-asọpụrụ ha.
14Ma otu ọ dị, ọtụtụ ndị nwoke na ndị nwanyị kwere nʼOnyenwe anyị sonyere ha.
15Nʼihi nke a, ndị mmadụ bupụtara ndị ọrịa nʼokporoụzọ nibe ha nʼute na ihe ndina, ka ọ ga-abụ mgbe Pita na-agafe onyinyo ya ga-adakwasị ụfọdụ nʼime ha.
16Igwe mmadụ zukọtara site nʼobodo ndị dị Jerusalem gburugburu. Ha butekwara ndị nrịa nrịa, na ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-enye nsogbu, a gwọkwara ha niile.
17Mgbe ahụ onyeisi nchụaja na ndị otu ya so nʼotu ndị Sadusii ka ekworo jupụtara obi.