Ọrụ Ndị Ozi 5

Mgbe onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu na ndịisi nchụaja nụrụ okwu ndị a, ọ gbara ha gharịị, ha na-eche ihe nke a ga-apụta.

Acts 5:24 (UKJV) Now when the high priest and the captain of the temple and the chief priests heard these things, they doubted of them unto which this would grow.

22Ma mgbe ndị ahụ ha zipụrụ ruru nʼụlọ mkpọrọ, ha ahụghị ndị ozi ahụ. Ha lọghachiri azụ kọọrọ ndị ọgbakọ ahụ ihe ha hụrụ,

23“Anyị hụrụ ka a kpọchiziri ụlọ mkpọrọ ahụ nke ọma, ndị nche guzokwa nʼọnụ ụzọ ya. Ma mgbe anyị meghere ụlọ mkpọrọ ahụ, anyị ahụghị onye ọbụla nʼime ya.”

24Mgbe onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu na ndịisi nchụaja nụrụ okwu ndị a, ọ gbara ha gharịị, ha na-eche ihe nke a ga-apụta.

25Nʼotu oge ahụ, otu onye gbabatara gwa ha, “Leenụ! Ndị ahụ unu tụbara nʼụlọ mkpọrọ guzo ugbu a nʼime ụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe.”

26Ngwangwa, onyeisi agha na ndị agha ya gara nʼụlọnsọ ahụ jide ndị ozi ahụ ma kpụta ha, ma ha ejighị ike mee nke a nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.