Ọrụ Ndị Ozi 5

Mgbe a kpụtara ha, e mere ka ha guzoro nʼihu ọgbakọ ndị Sanhedrin, onyeisi nchụaja jụrụ ha ajụjụ,

Acts 5:27 (UKJV) And when they had brought them, they set them before the council: and the high priest asked them,

25Nʼotu oge ahụ, otu onye gbabatara gwa ha, “Leenụ! Ndị ahụ unu tụbara nʼụlọ mkpọrọ guzo ugbu a nʼime ụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe.”

26Ngwangwa, onyeisi agha na ndị agha ya gara nʼụlọnsọ ahụ jide ndị ozi ahụ ma kpụta ha, ma ha ejighị ike mee nke a nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume.

27Mgbe a kpụtara ha, e mere ka ha guzoro nʼihu ọgbakọ ndị Sanhedrin, onyeisi nchụaja jụrụ ha ajụjụ,

28sị, “Ọ bụ anyị adọghị unu aka na ntị ka unu kwụsị ikuzi ihe nʼaha a; ma unu emeela ka ozizi unu jupụta Jerusalem niile kpebiekwa ime ka ọbara nwoke a dịrị anyị nʼisi.”

29Pita na ndị ozi ndị ọzọ zara sị, “Anyị ga-erubere Chineke isi ọ bụghị mmadụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.