38Ya onwe ya nọ nʼọgbakọ nʼọzara, ya na mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu nʼUgwu Saịnaị, na nna nna anyị ha; ebe ọ natakwara okwu dị ndụ inye anyị.
39“Ma nna nna anyị ha jụrụ irubere ya isi. Kama ha nupuru ya nʼakụkụ, ma tụgharịa laghachi azụ nʼIjipt nʼobi ha,
40na-asị Erọn, ‘Meere anyị chi, ndị nke ga-edu anyị, nʼihi na anyị amaghị ihe mere nwoke a bụ Mosis, onye sitere nʼala Ijipt dupụta anyị.’
41Ha kpụụrụ onwe ha arụsị nke oyiyi nwa ehi, ha butere ihe ịchụ aja nye ya. Ha ṅụrịrị ọṅụ nʼọrụ nke aka ha.
42Ma Chineke chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ. Ọ rara ha nye ikpere usuu ihe dị nʼeluigwe. Nke a dabara nʼihe e dere nʼakwụkwọ ndị amụma, “ ‘Unu ụlọ Izrel, unu o wetara m onyinye anụ e gburu egbu ka ọ dị aja unu chụụrụ m iri afọ anọ unu nọrọ nʼọzara?