Ọrụ Ndị Ozi 8

I nweghị oke maọbụ ihe nketa nʼọrụ a, nʼihi na obi gị ezighị ezi nʼihu Chineke.

Acts 8:21 (UKJV) You have neither part nor lot in this matter: for your heart is not right in the sight of God.

19sị, “nyekwanụ m ike a. Ka onye ọbụla m bikwasịrị aka nʼisi nata Mmụọ Nsọ.”

20Ma Pita sịrị, “Gị na ego gị laakwa nʼiyi. Nʼihi na i chere na ị ga-eji ego zụta onyinye Chineke.

21I nweghị oke maọbụ ihe nketa nʼọrụ a, nʼihi na obi gị ezighị ezi nʼihu Chineke.

22Si nʼajọ omume gị chegharịa, rịọ Onyenwe anyị arịrịọ ma eleghị anya ọ ga-agbaghara gị echiche ọjọọ niile nke obi gị.

23Nʼihi na ahụrụ m na ị jupụtara nʼobi ilu na ị nọkwa nʼagbụ nke ajọ omume.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.