10Otu onye nke na-eso ụzọ ya nọ na Damaskọs, a na-akpọ Ananayas. Onyenwe anyị gwara ya nʼọhụ, “Ananayas!” Ọ sịrị, “Lee m, Onyenwe anyị.”
11Onyenwe anyị gwara ya, “Gaa nʼụlọ Judas nke dị nʼokporoụzọ Guzoziri Eguzo, jụọ ajụjụ banyere onye a na-akpọ Sọl, onye si Tasọs, ọ nọ ugbu a na-ekpe ekpere.
12Ọ hụla ọhụ na otu nwoke a na-akpọ Ananayas na-abịakwute ya, ibikwasị ya aka nʼisi ka ọ hụ ụzọ.”
13Ma Ananayas zara, “Onyenwe anyị, anụla m akụkọ ihe ọjọọ niile nwoke a mere ndị nsọ gị bi na Jerusalem.
14Ugbu a, ọ natara ikike nʼaka ndịisi nchụaja bịa nʼebe a ka o jide ndị niile na-akpọku aha gị.”