14Ugbu a, ọ natara ikike nʼaka ndịisi nchụaja bịa nʼebe a ka o jide ndị niile na-akpọku aha gị.”
15Ma Onyenwe anyị gwara ya, “Gaa, nʼihi na ahọpụtala m nwoke a ka ọ bụrụ ngwa ọrụ m, onye ga-ewegara mba ndị ọzọ, ndị eze na ụmụ Izrel aha m.
16Mụ onwe m ga-egosi ya ụdị ahụhụ ọ na-aghaghị ịta nʼihi aha m.”
17Ya mere, Ananayas garuru nʼụlọ ahụ, banyekwa nʼime ya. Ọ bikwasịrị aka ya nʼisi Sọl, sị, “Nwanna Sọl, Onyenwe anyị Jisọs, onye gosiri gị onwe ya nʼụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ka ị jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.”
18Otu mgbe ahụ, ihe dịka akpịrịkpa sitere nʼanya ya dapụta, o bidokwara ịhụ ụzọ ọzọ. O biliri ọtọ, e mee ya baptizim.