17Ya mere, Ananayas garuru nʼụlọ ahụ, banyekwa nʼime ya. Ọ bikwasịrị aka ya nʼisi Sọl, sị, “Nwanna Sọl, Onyenwe anyị Jisọs, onye gosiri gị onwe ya nʼụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ka ị jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.”
18Otu mgbe ahụ, ihe dịka akpịrịkpa sitere nʼanya ya dapụta, o bidokwara ịhụ ụzọ ọzọ. O biliri ọtọ, e mee ya baptizim.
19Mgbe o richara nri, ọ nwetakwara ike ya. Ya na ndị na-eso ụzọ Jisọs nọrọ na Damaskọs ọtụtụ ụbọchị.
20Ngwangwa, o bidoro ikwusa Jisọs nʼụlọ nzukọ na-asị, Ọ bụ Ọkpara Chineke.
21O juru ndị niile nụrụ ya anya, ha na asị, “Ọ bụghị nwoke a bụ onye ahụ na-emekpa ndị niile na-akpọku aha ahụ na Jerusalem? Ọ bụ na ọ bụghị maka nke a ka o ji bịa ebe a ịkpụrụkwa ha kpụgara ndịisi nchụaja?”