Ọrụ Ndị Ozi 9

Ndị niile bi na Lida na Sharọn hụrụ ya. Nʼihi ya, ha nabatara Onyenwe anyị.

Acts 9:35 (UKJV) And all that dwelt at Lydda and Saron saw him, and turned to the Lord.

33Nʼebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Ainias. Nwoke a anọọla nʼute ọrịa afọ asatọ. Ọ bụ onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.

34Pita sịrị ya, “Ainias, Jisọs Kraịst agwọọla gị. Bilie mezie ute gị.” Ngwangwa, Ainias biliri ọtọ.

35Ndị niile bi na Lida na Sharọn hụrụ ya. Nʼihi ya, ha nabatara Onyenwe anyị.

36Nʼobodo Jopa, e nwere otu onye nwanyị na-eso ụzọ ya, nke aha ya bụ Tabita nke pụtakwara Dọkas na asụsụ Griik. O jupụtara nʼọrụ ọma, na ọrụ obi ebere nʼebe ụmụ ogbenye nọ.

37Nʼoge a, ọ rịara ọrịa, nwụọ. Mgbe ha sachara ya ahụ, ha nibere ya nʼotu ime ụlọ dị nʼụlọ elu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.