5Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda, ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.”
6Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Izrel, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha, reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ.
7Ha na-azọpịa isi ndị ike na-adịghị, na-echi ha ọnụ nʼaja, na-ewezuga ndị dị umeala nʼụzọ ezi ihe. Nwoke na nna ya na-edinakwuru otu nwaagbọghọ, si otu a merụọ aha nsọ m.
8Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla, nʼelu uwe ndị anatara na mbe. Nʼime ụlọnsọ chi ha, ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra.
9“Ma a lara m ndị Amọrait nʼiyi nʼihu ha, ndị ahụ dị ogologo dịka osisi sida, ndị sikwara ike dịka osisi ook. Alara m mkpụrụ ha dị nʼelu, na mgbọrọgwụ ha niile dị nʼokpuru nʼiyi.