19Ọ ga-adị ka onye si nʼihu ọdụm na-agbapụ ma zute anụ ọhịa bịa, maọbụ onye gbabara nʼụlọ ya izuike ma tụkwasị aka ya nʼaja ụlọ, agwọ ataa ya.
20Ụbọchị Onyenwe anyị ọ gaghị abụ ụbọchị ọchịchịrị, na-abụghị ìhè, nke oke ọchịchịrị, a na-agaghị enwe ìhè ọbụla na ya?
21“Akpọrọ m mmemme oriri na ọṅụṅụ unu asị, ajụla m ya. Nnọkọ nke oke nzukọ unu adịghị atọkwa m ụtọ.
22A sịkwarị na unu bunyere m aja nsure ọkụ unu na aja mkpụrụ ọka unu, agaghị m anabata ha. Aja udo nke anụ unu gbara abụba abụrụghị m ihe ọbụla.
23Sitenụ nʼebe m nọ wezuga ụzụ ịbụ abụ unu. Agaghị m ege ntị nʼabụ ụbọ akwara unu.