10Ma ọ bụrụ na nwanna, bụ onye nke na-aga ịkpọ anụ ahụ ndị a ọkụ, abata ibupụ ha nʼezi, ọ jụọ otu onye nọ nʼime ime ụlọ ahụ sị, “O nwere onye ọzọ gị na ya nọ?” Onye ahụ zaa, “Ọ dịghị,” mgbe ahụ nwanna ahụ ga-asị, “Nọọ jụụ. Anyị agaghị akpọ aha Onyenwe anyị.”
11Nʼihi na lee, Onyenwe anyị e nyela iwu. Ọ ghaghị itikpọsị ụlọ ukwu ndị ahụ, tiriekwa ụlọ nta ndị ahụ niile.
12Ịnyịnya ọ na-agba ọsọ nʼelu nkume? Mmadụ ọ na-eji ehi abụọ e jikọtara ọnụ akọ elu osimiri? Ma unu atụgharịala ikpe ziri ezi mee ya ka ọ ghọọ nsi, mkpụrụ nke ezi omume ka unu mekwara ka ọ ghọọ ihe ilu.
13Unu ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na unu meriri obodo Lo Deba, ndị na-asị, “Ọ bụghị site nʼike aka anyị ka anyị nwetakwara Kanaịm?”
14“Ma lee, aghaghị m ime ka otu mba bilie imegide unu, ụlọ Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. “Ha ga-emekpa unu ahụ site nʼụzọ niile site na Lebo Hamat ruo ndagwurugwu Araba.”