Emọs 6

Ma ọ bụrụ na mmadụ iri afọdụ nʼime otu ụlọ, ha niile aghaghị ịnwụ.

Amos 6:9 (UKJV) And it shall come to pass, if there remain ten men in one house, that they shall die.

7Nʼihi ya, unu ga-abụ ndị a ga-ebu ụzọ mee ka ha jee biri nʼala ndị ọzọ. Na mberede, oke oriri unu na idina ala setịa onwe unu ga-akwụsị.

8Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela onwe ya ṅụọ iyi, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ekwupụtala sị, “Ihe arụ ka mfụli elu nke Jekọb bụrụ m; ana m akpọkwa ebe ya niile e wusiri ike asị. Nʼihi ya, aghaghị m iwere obodo a na ihe niile dị ya nʼime nyefee nʼaka ndị ọzọ.”

9Ma ọ bụrụ na mmadụ iri afọdụ nʼime otu ụlọ, ha niile aghaghị ịnwụ.

10Ma ọ bụrụ na nwanna, bụ onye nke na-aga ịkpọ anụ ahụ ndị a ọkụ, abata ibupụ ha nʼezi, ọ jụọ otu onye nọ nʼime ime ụlọ ahụ sị, “O nwere onye ọzọ gị na ya nọ?” Onye ahụ zaa, “Ọ dịghị,” mgbe ahụ nwanna ahụ ga-asị, “Nọọ jụụ. Anyị agaghị akpọ aha Onyenwe anyị.”

11Nʼihi na lee, Onyenwe anyị e nyela iwu. Ọ ghaghị itikpọsị ụlọ ukwu ndị ahụ, tiriekwa ụlọ nta ndị ahụ niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.