8Onyenwe anyị sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ihe ịtụ mgbidi.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru, “Lee, mụ onwe m na-edo ihe ịtụ mgbidi nʼetiti ndị m bụ Izrel, agaghịkwa m esi ebe ha nọ gafee.
9“Ebe niile e wuliri elu nke Aịzik aghaghị ịbụ ebe e mebiri emebi, ebe nsọ niile nke Izrel aghaghị ịbụ ebe tọgbọrọ nʼefu, aghakwaghị m iweli mma agha m elu iji megide ụlọ Jeroboam.”
10Mgbe ahụ, Amazaya onye nchụaja nọ na Betel zigaara Jeroboam bụ eze Izrel ozi na-asị, “Emọs na-akwalị izu nzuzo ka ọ megide gị nʼetiti ụlọ Izrel, ala apụghị ibu okwu niile sị ya nʼọnụ apụta.
11Nke bụ ihe Emọs nọ na-asị, “ ‘Jeroboam aghaghị ịnwụ site na mma agha, Izrel aghakwaghị isite nʼala amụrụ ha jee biri nʼala ọzọ, dịka ndị a dọtara nʼagha.’ ”
12Mgbe ahụ, Amazaya gwara Emọs, “Gị onye ọhụ ụzọ, gbara ọsọ gbalaa ala Juda. Jee nʼebe ahụ, rie achịcha nke sitere nʼibu amụma gị, nọrọkwa nʼebe ahụ buo amụma gị.