Ndị Kọlọsị 2

Onye na-adịghị ejidesikwa onye bụ isi aka ike, onye a na-esite nʼaka ya na-eme ka ahụ niile, nke nkwonkwo ha na akwara ha niile na-ejikọta nʼotu, too eto dị ka Chineke si chọọ ka ha too.

Colossians 2:19 (UKJV) And not holding the Head, from which all the body by joints and bands having nourishment ministered, and knit together, increases with the increase of God.

17Ihe ndị a niile bụ onyinyo nke ihe ga-abịa nʼọdịnihu ma nke pụtara ihe dị nʼime Kraịst.

18Unu ekwela ka onye ọbụla nke ọ na-amasị ife ndị mmụọ ozi maọbụ ibi ndụ umeala nke aghụghọ dị nʼime ya, onye na-ekwu ọtụtụ okwu banyere ọhụ ọ hụrụ, si otu a na-afụli onwe ya elu nʼefu nʼihi echiche nke onwe ya, maa unu ikpe ma napụ unu ihe nrite unu.

19Onye na-adịghị ejidesikwa onye bụ isi aka ike, onye a na-esite nʼaka ya na-eme ka ahụ niile, nke nkwonkwo ha na akwara ha niile na-ejikọta nʼotu, too eto dị ka Chineke si chọọ ka ha too.

20Ebe ọ bụ na unu esorola Kraịst nwụọ nʼebe ozizi na amamihe niile nke na-achị ụwa nọ, gịnị mekwaranụ unu ji ka na-ebi ndụ dị ka a ga-asị na unu bụ nke ụwa, gịnị mere unu ji na-edo onwe unu nʼokpuru iwu ya dị iche?

21“Ejidela nke a aka, edetụla nke a ire, ebitụkwala nke a aka”?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.