3Ọ bụkwa nʼime ya ka ụlọakụ ihe zoro ezo niile nke amamihe na ihe ọmụma dị.
4Ana m ekwu nke a ka onye ọbụla ghara iji ire ụtọ duhie unu ụzọ.
5Ọ bụ ezie na anọghị m nʼetiti unu nʼanụ ahụ, ma anọ m nʼetiti unu nʼime mmụọ. Ana m aṅụrị ọṅụ ịhụ mkpebi unu na iguzosi ike nʼokwukwe unu nʼime Kraịst.
6Ya mere, dị ka unu si nabata Kraịst Jisọs Onyenwe anyị, na-ebinụ ndụ unu nʼime ya.
7Bụrụnụ ndị mgbọrọgwụ ha mibanyere nʼime ya, ndị a na-ewuli elu nʼime ya, ndị dị ike nʼime okwukwe, dị ka e si kuziere unu, ndị jupụtara na-inye ekele.